Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Devid sịrị ya, “Atụla egwu, nʼezie, aga m egosi gị obiọma nʼihi nna gị Jonatan. Aga m enyeghachi gị ala niile nna nna gị Sọl nwere. Ma ị ga-eso soro m na-eri nri na tebul m oge niile.”

2 Samuel 9:7 in English

2 Samuel 9:7 · Berean Standard Bible

“Do not be afraid,” said David, “for surely I will show you kindness for the sake of your father Jonathan. I will restore to you all the land of your grandfather Saul, and you will always eat at my table.”

Context

5Ya mere eze Devid ziri ka e site nʼobodo Lo Deba, nʼụlọ Makia nwa Amiel kpọta ya. 6Mgbe Mefiboshet nwa Jonatan, nwa Sọl, bịara nʼebe Devid nọ, o hulatara isi, kpọọrọ ya isiala, nʼọnọdụ nsọpụrụ. Mgbe ahụ, Devid kpọrọ ya aha sị, “Mefiboshet,” Mefiboshet zara sị ya, “A bụ m ohu gị.” 7Ma Devid sịrị ya, “Atụla egwu, nʼezie, aga m egosi gị obiọma nʼihi nna gị Jonatan. Aga m enyeghachi gị ala niile nna nna gị Sọl nwere. Ma ị ga-eso soro m na-eri nri na tebul m oge niile.” 8Mefiboshet dara nʼala nʼihu eze sị, “Eze, onye ka m bụ i ji egosi nkịta nwụrụ anwụ dịka m obi ebere?” 9Eze kpọrọ Ziba ohu Sọl ahụ sị ya, “Enyeghachila m nwa nwa nna gị ukwu ihe niile Sọl na ụlọ ya nwere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.