Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Eze jụrụ ya sị, “Ọ dị onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Ọ bụrụ na ọ dị onye fọdụrụ, achọrọ m igosi ya ụdị obiọma Chineke na-egosi.” Ziba zara ya sị, “Otu nwa nwoke Jonatan, nke dara ngwụrọ nọ ndụ.”

2 Samuel 9:3 in English

2 Samuel 9:3 · Berean Standard Bible

So the king asked, “Is there anyone left of Saul’s family to whom I can show the kindness of God?” Ziba answered, “There is still Jonathan’s son, who is lame in both feet.”

Context

1Otu ụbọchị, Devid jụrụ ajụjụ sị, “O nwere onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Achọrọ m igosi onye ahụ obi ebere nʼihi Jonatan.” 2Ọ nụrụ ihe banyere otu nwoke aha ya bụ Ziba, onye bụ otu nʼime ndị ohu Sọl. O ziri ozi ka a kpọọ ya. Mgbe ọ bịara nʼihu Devid, eze jụrụ ya sị, “Ọ bụ gị bụ Ziba?” Ọ zara sị, “E, onyenwe m, ọ bụ m ohu gị.” 3Eze jụrụ ya sị, “Ọ dị onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Ọ bụrụ na ọ dị onye fọdụrụ, achọrọ m igosi ya ụdị obiọma Chineke na-egosi.” Ziba zara ya sị, “Otu nwa nwoke Jonatan, nke dara ngwụrọ nọ ndụ.” 4Eze jụrụ, “Ebee ka ọ nọ?” Ziba zaghachiri, “Ọ nọ na Lo Deba, nʼụlọ Makia, nwa Amiel.” 5Ya mere eze Devid ziri ka e site nʼobodo Lo Deba, nʼụlọ Makia nwa Amiel kpọta ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.