Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị ozi gị ga-arụ ọrụ nʼubi ya ịrụpụta nri. Ma Mefiboshet, nwa nwa nna gị ukwu ga na-eri ihe na tebul m.” Ziba, nwere ụmụ ndị ikom iri na ise, na iri ndị ozi abụọ.

2 Samuel 9:10 in English

2 Samuel 9:10 · Berean Standard Bible

You and your sons and servants are to work the ground for him and bring in the harvest, so that your master’s grandson may have food to eat. But Mephibosheth, your master’s grandson, is always to eat at my table.” Now Ziba had fifteen sons and twenty servants.

Context

8Mefiboshet dara nʼala nʼihu eze sị, “Eze, onye ka m bụ i ji egosi nkịta nwụrụ anwụ dịka m obi ebere?” 9Eze kpọrọ Ziba ohu Sọl ahụ sị ya, “Enyeghachila m nwa nwa nna gị ukwu ihe niile Sọl na ụlọ ya nwere. 10Gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị ozi gị ga-arụ ọrụ nʼubi ya ịrụpụta nri. Ma Mefiboshet, nwa nwa nna gị ukwu ga na-eri ihe na tebul m.” Ziba, nwere ụmụ ndị ikom iri na ise, na iri ndị ozi abụọ. 11Ọ sịrị eze, “Onyenwe m, ohu gị ga-eme ihe niile eze nyere m nʼiwu.” Site nʼoge ahụ, Mefiboshet riri nri na tebul* Devid dịka ọ bụ otu nʼime ụmụ ndị ikom eze. 12Mefiboshet nwekwara otu nwa nwoke aha ya bụ Mika. Ziba na ndị niile bi nʼụlọ ya niile ghọrọ ndị ohu Mefiboshet.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.