2 Samuel 7:8
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma ugbu a, gwa Devid bụ ohu m, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: Mụ onwe m sitere nʼọhịa ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ, sikwa nʼebe ị na-azụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta gị. Mee gị onye na-achị ndị m Izrel.
2 Samuel 7:8 in English
2 Samuel 7:8 · Berean Standard Bible
Now then, you are to tell My servant David that this is what the LORD of Hosts says: I took you from the pasture, from following the flock, to be the ruler over My people Israel.
Context
6Nʼihi na ebibeghị m nʼụlọ site nʼụbọchị m si nʼIjipt kpọpụta ndị Izrel ruo taa. Kama ana m ejegharị site otu ebe gaa ebe ọzọ, were ụlọ ikwu mere ebe obibi m. 7Nʼebe ọbụla m na-ejegharị nʼetiti ndị Izrel niile, ọ dị mgbe m sịrị onye ọbụla nʼime ndị ọchịchị ha, ndị m nyere iwu ka ha zụọ ndị m Izrel, sị, “Gịnị mere unu ewubereghị m ụlọ sida?” ’ 8“Ma ugbu a, gwa Devid bụ ohu m, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: Mụ onwe m sitere nʼọhịa ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ, sikwa nʼebe ị na-azụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta gị. Mee gị onye na-achị ndị m Izrel. 9Anọnyekwara m gị nʼebe ọbụla ị gara, kpochapụ ndị iro gị niile site nʼihu gị. Ugbu a, aga m eme ka aha gị dị ukwuu, dịka aha ndị ikom dịkarịsịrị ukwuu nʼụwa. 10Aga m ahọpụta otu ebe nʼihi ndị m Izrel, kụkwa ha dịka osisi ka ha biri nʼebe obibi nke aka ha; ka ha ghara ị bụkwa ndị a na-esogbu ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emegbukwa ha dịka ha mere na mbụ,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.