2 Samuel 3:38
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Devid jụrụ ndị ikom ya ajụjụ sị, “Unu ghọtakwara na onye a dara nʼIzrel taa bụ nwa eze na onye dị mkpa?
2 Samuel 3:38 in English
2 Samuel 3:38 · Berean Standard Bible
Then the king said to his servants, “Do you not realize that a great prince has fallen today in Israel?
Context
36Ndị mmadụ nụrụ ihe o kwuru, okwu ahụ tọkwara ha ụtọ. Nʼezie, ihe niile eze mere tọrọ ha ụtọ. 37Nʼụbọchị ndị mmadụ niile nọ ebe ahụ ka Izrel niile matara na eze amaghị ihe banyere ọnwụ Abna, nwa Nea. 38Devid jụrụ ndị ikom ya ajụjụ sị, “Unu ghọtakwara na onye a dara nʼIzrel taa bụ nwa eze na onye dị mkpa? 39Ọ bụ ezie na m bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ ịbụ eze, ma o nweghị ihe m pụrụ ime ụmụ ndị ikom Zeruaya ndị a, nʼihi na ha dị ike karịa m. Ka Onyenwe anyị kwụghachi onye ọjọọ ihe ọjọọ ọ mere.”
3:3 Geshua, bụ otu mpaghara nʼalaeze ndị Siria ebe Absalọm gbalagara maka ize ndu. Jos 13:13; 1Sa 27:8; 2Sa 13:37-38; 14:32; 15:8
3:10 Mgbe ọbụla e kwuru otu a, site na Dan ruo Bịasheba, ọ bụ banyere ndị Izrel niile ka a na-ekwu maka ya. Nke a bụ i site na nsọtụ ebe ugwu ruo na nsọtụ ndịda. Nkp 20:1; 1Sa 3:20; 2Sa 17:11; 1Ez 4:25
3:29 Dit 21:6-9; 1Ez 2:32-33
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.