Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼotu mgbe ahụ, ndị ikom Devid na Joab si nʼebe ha gara ịpụnara ndị mmadụ ihe lọta, bukọrọ ọtụtụ ihe nkwata. Ma Abna anọghịkwa na Hebrọn ya na Devid, nʼihi na Devid ezipụla ya, ọ pụọla nʼudo.

2 Samuel 3:22 in English

2 Samuel 3:22 · Berean Standard Bible

Just then David’s soldiers and Joab returned from a raid, bringing with them a great plunder. But Abner was not with David in Hebron because David had sent him on his way in peace.

Context

20Abna, ya na iri ndị ikom abụọ so gakwuru Devid na Hebrọn. Mgbe ha ruru, Devid meere ha oke oriri. 21Mgbe ahụ, Abna sịrị Devid, “Ka m gaa ngwangwa ga kpọkọtaa ndị Izrel niile, nye onyenwe m bụ eze, ka gị na ha gbaa ndụ, ka ị bụrụ eze ndị niile mkpụrụobi gị na-achọsi ike.” Ya mere Devid zilara Abna. Ọ laa nʼudo. 22Nʼotu mgbe ahụ, ndị ikom Devid na Joab si nʼebe ha gara ịpụnara ndị mmadụ ihe lọta, bukọrọ ọtụtụ ihe nkwata. Ma Abna anọghịkwa na Hebrọn ya na Devid, nʼihi na Devid ezipụla ya, ọ pụọla nʼudo. 23Mgbe Joab na ndị agha ya lọtara, a kọọrọ ya na Abna, nwa Nea, bịara hụ eze, na ọ laakwala nʼudo. 24Ya mere Joab jekwuuru eze sị ya, “Gịnị ka i mere? Lee, Abna bịakwutere gị. Gịnị mere i ji hapụ ya ka ọ laa? Lee ya ugbu a, ọ laala!

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.