Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha jere ruokwa nʼebe e wusiri ike nke Taịa, na obodo niile nke ndị Hiv,* na nke ndị Kenan. Nʼikpeazụ, ha gaara ruo Bịasheba nʼime ndịda Juda.

2 Samuel 24:7 in English

2 Samuel 24:7 · Berean Standard Bible

They went toward the fortress of Tyre and all the cities of the Hivites and Canaanites. Finally, they went on to the Negev of Judah,* to Beersheba.

Context

5Mgbe ha gabigachara Jọdan, ha manyere ụlọ ikwu ha na nso Aroea, nʼaka nri obodo ahụ dị nʼetiti ndagwurugwu Gad na-eru Jeza, 6ha gara Gilead ruokwa nʼala Taatim Hodshi, bịarukwaa Dan Jaan, jee gburugburu jeruo Saịdọn. 7Ha jere ruokwa nʼebe e wusiri ike nke Taịa, na obodo niile nke ndị Hiv,* na nke ndị Kenan. Nʼikpeazụ, ha gaara ruo Bịasheba nʼime ndịda Juda. 8Mgbe ha jegharịchara nʼala ahụ niile; ha lọghachitere na Jerusalem na ngwụcha ọnwa nke itoolu na iri abalị abụọ ya. 9Joab nyere eze ngụkọta ọnụọgụgụ nke ndị agha Izrel. NʼIzrel, ha dị narị puku asatọ, bụ ndị ikom ndị tozuru iji mma agha buo agha, na Juda ha dị narị puku ise.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.