Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid sịrị Gad, “Anọ m nʼoke nsogbu, ọ ka mma ka anyị daba nʼaka Onyenwe anyị karịa ịdaba nʼaka mmadụ, nʼihi na obi ebere ya bara ụba.”

2 Samuel 24:14 in English

2 Samuel 24:14 · Berean Standard Bible

David answered Gad, “I am deeply distressed. Please, let us fall into the hand of the LORD, for His mercies are great; but do not let me fall into the hands of men.”

Context

12“Gaa gwa Devid, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ụzọ ihe atọ ka m na-eche gị nʼihu. Họrọ otu nʼime ha nke m ga-eme ka ọ bịakwasị gị.’ ” 13Ya mere, Gad jekwuuru Devid sị ya, “Ọ bụ ka oke ụnwụ ịda nʼala gị afọ atọ? Ka ọ bụ na ị ga-agbalaga site nʼihu ndị iro gị ọnwa atọ, ka ha na-achụ gị ọsọ? Ka ọ bụ ka ajọ ọrịa na-efe efe daa nʼala gị mkpụrụ ụbọchị atọ? Ugbu a, chee echiche, kpebie ọsịsa ị chọrọ ka m weghachiri onye ahụ zitere m.” 14Devid sịrị Gad, “Anọ m nʼoke nsogbu, ọ ka mma ka anyị daba nʼaka Onyenwe anyị karịa ịdaba nʼaka mmadụ, nʼihi na obi ebere ya bara ụba.” 15Nʼihi ya, Onyenwe anyị zitere ajọ ọrịa na-efe efe nʼala Izrel, site nʼụtụtụ ahụ ruo oge akara aka. Ọ bụ iri puku mmadụ asaa nwụrụ site na Dan ruo Bịasheba. 16Mgbe mmụọ ozi ahụ setịpụrụ aka ya ibibi Jerusalem, o wutere Onyenwe anyị nʼihi oke mbibi ahụ. Ọ sịrị mmụọ ozi ahụ nke na-eweta nhụju anya nye ndị mmadụ, “O zuola. Seghachi aka gị.” Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị nọ nʼebe ịzọcha ọka Arauna onye Jebus.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.