Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu. Ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ, site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!”

2 Samuel 23:15 in English

2 Samuel 23:15 · Berean Standard Bible

David longed for water and said, “Oh, that someone would get me a drink of water from the well near the gate of Bethlehem!”

Context

13Nʼoge owuwe ihe ubi, mmadụ atọ nʼime iri ndị dike atọ ahụ, jekwuru Devid nʼọgba nkume Adulam, mgbe otù ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Refaim. 14Ma Devid nọ nʼebe ahụ ewusiri ike nʼoge ahụ, ma ọnọdụ ndị agha Filistia dị na Betlehem. 15Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu. Ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ, site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!” 16Ya mere, ndị dike nʼagha atọ ahụ wakpuru ọmụma ụlọ ikwu ndị Filistia, seta mmiri site nʼolulu mmiri ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Betlehem, bulatara ya Devid. Ma Devid jụrụ ịṅụ ya, kama ọ wufuru ya nʼala nʼihu Onyenwe anyị. 17Ọ sịrị, “Ya bụrụ m ihe arụ, Onyenwe anyị, na m ga-eme nke a. Nke a ọ bụghị ọbara ndị ikom a, ndị ji ndụ ha chụọ aja nʼihi ikute mmiri a?” Devid ekweghị aṅụ ya. Nke a bụ ụdị ike dike atọ ahụ kpara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.