Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye nke atọ bụ Shama, nwa Agee, onye Hara. Mgbe ndị Filistia chịkọtara onwe ha nʼotu ebe, nke e nwere otu ubi jupụtara na lentil, ma ndị agha Izrel niile sitere nʼebe ha nọ gbapụ.

2 Samuel 23:11 in English

2 Samuel 23:11 · Berean Standard Bible

And after him was Shammah son of Agee the Hararite. When the Philistines had banded together near a field full of lentils, Israel’s troops fled from them.

Context

9Onye nke na-eso ya bụ Elieza, nwa Dodayi, onye Ahohi. Dịka otu nʼime ndị dike atọ ahụ, ya na Devid nọ mgbe ha na-akwa ndị Filistia emo, bụ ndị zukọrọ na Pas Damim ibu agha.* Mgbe ahụ, ndị Izrel lara azụ, 10ma Elieza guzoro na-alaghị azụ. O gbugidere ndị Filistia ruo mgbe ike gwuru aka ya. Aka ya rapakwaara na mma agha. Onyenwe anyị nyekwara ha mmeri dị ukwuu nʼụbọchị ahụ. Ndị agha ahụ laghachikwutere Elieza, maọbụ naanị ka ha yipụsịa ndị ahụ e gburu egbu ihe ha yi nʼahụ. 11Onye nke atọ bụ Shama, nwa Agee, onye Hara. Mgbe ndị Filistia chịkọtara onwe ha nʼotu ebe, nke e nwere otu ubi jupụtara na lentil, ma ndị agha Izrel niile sitere nʼebe ha nọ gbapụ. 12Ma naanị Shama guzoro nʼetiti ubi lentil ahụ. Ọ napụtara ya, tigbuo ndị Filistia niile ahụ. Onyenwe anyị nyere mmeri dị ukwuu. 13Nʼoge owuwe ihe ubi, mmadụ atọ nʼime iri ndị dike atọ ahụ, jekwuru Devid nʼọgba nkume Adulam, mgbe otù ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Refaim.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.