2 Samuel 21:14
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha liri ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan nʼobodo Zela nʼala Benjamin, nʼime ili Kish nna Sọl, meekwa ihe ndị ọzọ niile eze nyere nʼiwu. Mgbe nke a gasịrị, Chineke zara ekpere nʼihi ala ahụ.
2 Samuel 21:14 in English
2 Samuel 21:14 · Berean Standard Bible
And they buried the bones of Saul and his son Jonathan in Zela in the land of Benjamin, in the tomb of Saul’s father Kish. After they had done everything the king had commanded, God answered their prayers for the land.
Context
12ọ gara chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya Jonatan site nʼaka ndị nwe obodo Jebesh Gilead. Ha gara na nzuzo zuru ozu Sọl na Jonatan site nʼama dị na Bet-Shan, ebe ndị Filistia kwụbara ha, oge ha gburu Sọl na Gilboa. 13Devid sitere nʼebe ahụ chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan, chịkọtaakwa ọkpụkpụ ndị ahụ akwụgburu. 14Ha liri ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan nʼobodo Zela nʼala Benjamin, nʼime ili Kish nna Sọl, meekwa ihe ndị ọzọ niile eze nyere nʼiwu. Mgbe nke a gasịrị, Chineke zara ekpere nʼihi ala ahụ. 15Emesịa, ndị Filistia busokwara Izrel agha ọzọ. Devid na ndị agha ya pụkwara ịlụso ha ọgụ. Nʼoge ha na-alụ ọgụ a, ike gwụrụ Devid nke ukwuu. 16Mgbe ahụ, Ishibi-Benob, otu onye agbụrụ Rafa, onye ịdị arọ nke bronz dị nʼọnụ ùbe ya ruru kilogram atọ na ọkara, onye jikwa mma agha ọhụrụ, bịaruru Devid nso chọọ igbu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.