Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị ikom Juda bịakwutere Devid na Hebrọn. Tee ya mmanụ ịbụ eze ebo Juda niile. Mgbe Devid nụrụ na ọ bụ ndị ikom Jebesh Gilead liri Sọl,

2 Samuel 2:4 in English

2 Samuel 2:4 · Berean Standard Bible

Then the men of Judah came to Hebron, and there they anointed David king over the house of Judah. And they told David, “It was the men of Jabesh-gilead who buried Saul.”

Context

2Devid na nwunye ya abụọ, Ahinoam onye Jezril, na Abigel nwunye ochie Nebal onye Kamel gara nʼebe ahụ. 3Devid kpọkwaara ndị ikom ahụ ya na ha so, onye ọbụla nʼime ha durukwaara ezinaụlọ ya, ga biri na Hebrọn na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu. 4Ndị ikom Juda bịakwutere Devid na Hebrọn. Tee ya mmanụ ịbụ eze ebo Juda niile. Mgbe Devid nụrụ na ọ bụ ndị ikom Jebesh Gilead liri Sọl, 5o zigaara ha ndị ozi ka ha sị ha, “Ka Onyenwe anyị gọzie unu nʼihi obiọma unu gosiri site nʼili Sọl, nna unu ukwu, nʼụzọ kwesiri ekwesi. 6Ka Onyenwe anyị gosikwa unu obiọma na ikwesi ntụkwasị obi. Mụ onwe m ga-egosikwa unu otu ụdị amara a, nʼihi ihe a unu mere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.