Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Abna gwara ya okwu sị ya, “Tụgharịa nʼakụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, jide otu nʼime ụmụ okorobịa ndị a. Napụ ya ngwa agha ya niile.” Ma Asahel akwụsịghị ịchụ ya ọsọ.

2 Samuel 2:21 in English

2 Samuel 2:21 · Berean Standard Bible

So Abner told him, “Turn to your right or to your left, seize one of the young men, and take his equipment for yourself.” But Asahel would not stop chasing him.

Context

19Ọ chụwara Abna ọsọ, ọ dịghị mgbe ọ tụgharịrị gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe mgbe ọ nọ na-achụ ya ọsọ. 20Mgbe Abna lere anya nʼazụ hụ ya ka ọ na-abịa, ọ kpọrọ ya oku sị ya, “Ọ bụ gị Asahel?” Asahel zara sị, “Ọ bụ m.” 21Abna gwara ya okwu sị ya, “Tụgharịa nʼakụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, jide otu nʼime ụmụ okorobịa ndị a. Napụ ya ngwa agha ya niile.” Ma Asahel akwụsịghị ịchụ ya ọsọ. 22Abna gwara Asahel ọzọ sị, “Laghachi azụ. Kwụsị ịchụ m ọsọ! Gịnị mere m ga-eji tigbuo gị? Olee otu m ga-esi lekwasị nwanne gị Joab anya nʼihu ma m gbuo gị?” 23Ma Asahel jụrụ ịlaghachi azụ. Nʼihi ya, Abna weere isi ùbe ya mapuo ya afọ. Ùbe ahụ sikwa ya nʼazụ pụta. Ọ dara nʼala, nwụọ otu mgbe ahụ. Ndị niile bịaruru ebe ahụ ọ dara nwụọ kwụsịrị. Ha agakwaghị nʼihu ịchụ ndị ọzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.