Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Abna gwara Joab sị, “Ka ụfọdụ ụmụ okorobịa pụta nʼihu anyị maa aka mgba.” Joab sịrị, “Ka ha pụta.”

2 Samuel 2:14 in English

2 Samuel 2:14 · Berean Standard Bible

Then Abner said to Joab, “Let us have the young men get up and compete before us.” “Let them get up,” Joab replied.

Context

12Otu ụbọchị, Abna nwa Nea, duuru ndị agha Ishboshet nwa Sọl site na Mahanaim jee Gibiọn. 13Ma Joab,* nwa Zeruaya dukwaara ndị agha Devid pụọ izute ha nʼọdọ mmiri Gibiọn. Otu ndị nọdụrụ ala nʼotu akụkụ ọdọ mmiri, ndị nke ọzọ nʼakụkụ ọzọ nke ọdọ mmiri ahụ. Ha cherịtara onwe ha ihu. 14Abna gwara Joab sị, “Ka ụfọdụ ụmụ okorobịa pụta nʼihu anyị maa aka mgba.” Joab sịrị, “Ka ha pụta.” 15Ha pụtara ka a gụpụtachara ha. Ha dị mmadụ iri na abụọ site nʼetiti ndị agha Benjamin na Ishboshet nwa Sọl, mmadụ iri na abụọ site nʼetiti ndị agha Devid. 16Nwoke ọbụla jidere ibe ya nʼisi were mma agha ya manye ya nʼakụkụ, si otu a wetara onwe ha ọnwụ. Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ ebe ahụ dị na Gibiọn, Helkat Hazurim, nke pụtara Ala mma agha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.