2 Samuel 19:32
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge a, Bazilai bụ agadi nwoke, onye gbara iri afọ asatọ. Ọ lekọtara eze mgbe eze nọ na Mahanaim, nʼihi na ọ bụ ọgaranya.
2 Samuel 19:32 in English
2 Samuel 19:32 · Berean Standard Bible
Barzillai was quite old, eighty years of age, and since he was a very wealthy man, he had provided for the king while he stayed in Mahanaim.
Context
30Mefiboshet sịrị eze, “Ka o were ihe niile ebe onyenwe m bụ eze lọghachiri nʼụlọ ya nʼudo.” 31Bazilai onye Gilead* sikwa na Rogelim bịa iso eze kwọfee osimiri Jọdan, na izilaga ya site nʼebe ahụ. 32Nʼoge a, Bazilai bụ agadi nwoke, onye gbara iri afọ asatọ. Ọ lekọtara eze mgbe eze nọ na Mahanaim, nʼihi na ọ bụ ọgaranya. 33Eze gwara Bazilai sị ya, “Soro m gafee osimiri ka i soro m biri na Jerusalem. Aga m elekọtakwa gị.” 34Ma Bazilai zara eze sị ya, “Afọ ole ka ọ fọdụrụ m ịdị ndụ m ga-eji soro eze gaa Jerusalem?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.