Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

sị ya, “Ka Onyenwe m, ghara ịgụkọrọ m njehie m nye m. Echetakwala otu ohu gị si mee ihe nʼezighị ezi nʼụbọchị onyenwe m hapụrụ Jerusalem pụọ. Ka eze ghara itinye ya nʼobi ya,

2 Samuel 19:19 in English

2 Samuel 19:19 · Berean Standard Bible

and said, “My lord, do not hold me guilty, and do not remember your servant’s wrongdoing on the day my lord the king left Jerusalem. May the king not take it to heart.

Context

17Ya na puku ndị ikom Benjamin sokwa. Ziba, onyeozi Sọl, na ụmụ ya ndị ikom iri na ise, na iri ndị ozi abụọ ndị ozi ya, mekwara ngwangwa ịbịarute Jọdan tupu eze erute nʼebe ahụ. 18Ha gabigara mmiri nʼebe ọ dị nta ịkwọfe ndị ụlọeze nʼụgbọ mmiri, na ime ihe ọbụla dị mma nʼanya ya. Mgbe Shimei nwa Gera gafere Jọdan, ọ dara nʼala nʼihu eze, 19sị ya, “Ka Onyenwe m, ghara ịgụkọrọ m njehie m nye m. Echetakwala otu ohu gị si mee ihe nʼezighị ezi nʼụbọchị onyenwe m hapụrụ Jerusalem pụọ. Ka eze ghara itinye ya nʼobi ya, 20nʼihi na mụ bụ ohu gị maara na m mehiere, ma taa abịara m dịka onye mbụ site nʼagbụrụ Josef, ịbịa zute onyenwe m, bụ eze.” 21Abishai nwa Zeruaya jụrụ eze sị ya, “Ọ bụ na Shimei agaghị anwụ nʼihi ihe a? Nʼihi nkọcha ọ kọchara onye Onyenwe anyị tere mmanụ bụ eze.”*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.