Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Absalọm, onye anyị tere mmanụ ka ọ chịa anyị anwụọla nʼagha. Gịnị mere, unu a gaghị ekwu okwu i kpọghachite eze anyị?

2 Samuel 19:10 in English

2 Samuel 19:10 · Berean Standard Bible

But Absalom, the man we anointed over us, has died in battle. So why do you say nothing about restoring the king?”

Context

8Ya mere, eze biliri nọdụ ọdụ nʼọnụ ụzọ ama. Mgbe ndị agha nụrụ na eze nọ nʼọnụ ụzọ ama, ha niile pụtara guzo nʼihu ya. Ma nʼoge a, ndị Izrel niile agbalaala, onye ọbụla nʼụlọ ya. 9Nʼetiti ebo Izrel niile, ndị mmadụ nọ na-arụ ụka na-asị, “Eze napụtara anyị site nʼaka ndị iro anyị. Ọ bụ ya napụtara anyị site nʼaka ndị Filistia. Ma ugbu a, o sitela nʼala a gbapụ nʼihi Absalọm.” 10Absalọm, onye anyị tere mmanụ ka ọ chịa anyị anwụọla nʼagha. Gịnị mere, unu a gaghị ekwu okwu i kpọghachite eze anyị? 11Eze Devid zigaara Zadọk na Abịata, ndị nchụaja ozi a, “Jụọnụ ndị okenye Juda sị, ‘Nʼihi gịnị ka unu ga-eji bụrụ ndị ikpeazụ ime ka eze lọghachi nʼobi ya, ebe ọ bụ na ihe a na-ekwu nʼala Izrel niile eruola eze ntị nʼebe o bi? 12Ụmụnne m ka unu bụ, ọkpụkpụ m na anụ ahụ m. Gịnị mere unu ga-eji bụrụ ndị ikpeazụ ga-akpọlata eze nʼụlọ ya?’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.