2 Samuel 17:10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ọ bụladị dimkpa nʼagha ndị nwere obi ọdụm, ụjọ ga-atụkwa ha. Ha agaghị ekwekwa ịga nʼihu ọgụ. Nʼihi na Izrel niile maara na nna gị bụ dike. Ha maakwara na ndị agha ya bụkwa ndị obi kara aka.
2 Samuel 17:10 in English
2 Samuel 17:10 · Berean Standard Bible
Then even the most valiant soldier with the heart of a lion will melt with fear, because all Israel knows that your father is a mighty man who has valiant men with him.
Context
8Ọ sịrị, Gị onwe gị maara nna gị na ndị ikom ya; ha bụ ndị dike nʼagha, mkpụrụobi ha dịkwa ilu ugbu a dịka anụ ọhịa bịa a gbabara aka nwa nʼọhịa. Nna gị bụ onye ihe banyere agha doro anya. Ọ gaghị eso ndị ya nọọ ọnọdụ abalị. 9Ọ bụladị ugbu a, o zoola onwe ya nʼime otu olulu maọbụ nʼime ọgba nkume. Ọ bụrụ na ọ pụta buru ụzọ buso ndị agha gị agha, onye ọbụla nụrụ ya ga-ekwu sị, ‘Etigbuola ndị agha Absalọm oke ntigbu.’ 10Mgbe ahụ, ọ bụladị dimkpa nʼagha ndị nwere obi ọdụm, ụjọ ga-atụkwa ha. Ha agaghị ekwekwa ịga nʼihu ọgụ. Nʼihi na Izrel niile maara na nna gị bụ dike. Ha maakwara na ndị agha ya bụkwa ndị obi kara aka. 11“Ndụmọdụ m na-enye bụ nke a: chịkọtaa ndị Izrel niile, site na Dan ruo Bịasheba, ha dịka aja nke dị nʼakụkụ oke osimiri. Ọ bụkwa gị ga-edu ha nʼagha ahụ. 12Mgbe ahụ, anyị ga-ebuso ya agha ebe ọbụla anyị hụrụ ya; anyị ga-abịakwasị ya dịka igirigi si adakwasị ala. Anyị ga-egbu ya, gbukwaa ndị niile so ya. Otu onye agaghị afọdụkwa nʼime ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.