2 Samuel 17:1
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahitofel gwara Absalọm sị ya, “Kwere ka m họpụta puku ndị ikom iri na abụọ ka m duru ha chụso Devid ọsọ nʼazụ nʼabalị taa.
2 Samuel 17:1 in English
2 Samuel 17:1 · Berean Standard Bible
Furthermore, Ahithophel said to Absalom, “Let me choose twelve thousand men and set out tonight in pursuit of David.
Context
1Ahitofel gwara Absalọm sị ya, “Kwere ka m họpụta puku ndị ikom iri na abụọ ka m duru ha chụso Devid ọsọ nʼazụ nʼabalị taa. 2Aga m abịakwasị ya mgbe ike gwụrụ ya, mgbe obi ya na-ada mba. Aga m emenye ya egwu nke ga-eme ka ọ maa jijiji. Mgbe ahụ, ndị niile so ya ga-agbasasịkwa. Ọ bụ naanị eze ka m ga-egbu 3Aga m eme ka ndị ya niile lọghachikwute gị. Ọnwụ nke otu nwoke a ị na-achọsi ndụ ya ike ga-eme ndị ọzọ niile ịlọghachikwute gị, onye ọbụla ga-anọ nʼudo.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.