2 Samuel 16:5
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka eze bụ Devid na-abịaru obodo Bahurim,* lee, otu nwoke sitere nʼagbụrụ ụlọ Sọl sitere nʼebe ahụ pụta. Ọ bụ Shimei* nwa Gera. Ọ na-akọcha mgbe ọ na-apụta ya.
2 Samuel 16:5 in English
2 Samuel 16:5 · Berean Standard Bible
As King David approached Bahurim, a man from the family of the house of Saul was just coming out. His name was Shimei son of Gera, and as he approached, he kept yelling out curses.
Context
3Eze jụrụ ya sị, “Ebeekwanụ ka nwa nna gị ukwu nọ?”
Ziba zara ya sị, “Ọ nọ na Jerusalem nʼihi na ọ sịrị, ‘Taa ụlọ Izrel ga-enyeghachi m alaeze nna nna m.’ ” 4Eze gwara Ziba sị ya, “Nʼihi ya, enyela m gị ihe niile Mefiboshet nwere, ha ga-abụkwa nke gị.”
Ziba sịrị, “Ka m hụta amara nʼihu eze, bụ onyenwe m.” 5Dịka eze bụ Devid na-abịaru obodo Bahurim,* lee, otu nwoke sitere nʼagbụrụ ụlọ Sọl sitere nʼebe ahụ pụta. Ọ bụ Shimei* nwa Gera. Ọ na-akọcha mgbe ọ na-apụta ya. 6Ọ chịịrị nkume na-atụ Devid na ndị ozi eze niile. Ọ bụ ezie na ndị agha Izrel na ndị na-eche Devid nche gbara ya gburugburu nʼaka nri na aka ekpe. 7Ma dịka Shimei na-akọcha, ọ sịrị, “Si nʼebe a pụọ, si nʼebe a pụọ, gị ogbu mmadụ, gị onye ọjọọ!
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.