Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma eleghị anya, Onyenwe anyị ga-ahụ ọnọdụ ahụhụ m, nyeghachikwa m ngọzị nʼọnọdụ nkọcha ndị a.”

2 Samuel 16:12 in English

2 Samuel 16:12 · Berean Standard Bible

Perhaps the LORD will see my affliction and repay me with good for the cursing I receive today.”

Context

10Ma eze zara sị, “Gịnị jikọrọ mụ na unu, unu ụmụ ndị ikom Zeruaya. Ọ bụrụ na ọ na-akọcha m nʼihi na Onyenwe anyị sị ya ‘Kọchaa Devid,’ onye pụrụ ịjụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere ị ji na-eme ihe dị otu a?’ ” 11Mgbe ahụ, Devid gwara Abishai na ndị ozi ya okwu sị, “Nwa m nwoke, onye si nʼahụ m na-agbalị ịnapụ m ndụ m. Gịnị ga-eme ka onye Benjamin a ghara ime karịa? Hapụ ya, ya kọchaa, nʼihi na Onyenwe anyị agwala ya ka ọ kọchaa m. 12Ma eleghị anya, Onyenwe anyị ga-ahụ ọnọdụ ahụhụ m, nyeghachikwa m ngọzị nʼọnọdụ nkọcha ndị a.” 13Ya mere, Devid na ndị ya gakwara nʼihu ije ha nʼụzọ ahụ ma Shimei sokwara ha na-aga nʼakụkụ ugwu ahụ na-akọcha ha. Ọ nọgidekwara na-atụ Devid nkume, na-ekpolikwa aja elu ka ọ na-awụsa ha nʼahụ. 14Ya mere, eze na ndị niile so ya gagidere bịaruo nʼakụkụ Jọdan nʼọnọdụ ike ọgwụgwụ. Nʼihi ya, ha nọdụrụ nʼebe ahụ zuo ike.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.