Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ugbu a, ndị ikwu di m na-esogbu m na-asị ‘Kpọpụta onye ahụ gburu nwanne ya ka anyị gbuo ya nʼihi ndụ nwanne ya o wepụrụ, ka anyị si otu a memilaa onye nke fọdụrụ ga-erita oke ezinaụlọ.’ Ha chọrọ isi otu a menyụọ icheku ọkụ nke fọdụụrụ m, nke bụ na di m agaghị enwezikwa aha maọbụ onye fọdụụrụ ya nʼelu ụwa.”

2 Samuel 14:7 in English

2 Samuel 14:7 · Berean Standard Bible

Now the whole clan has risen up against your maidservant and said, ‘Hand over the one who struck down his brother, that we may put him to death for the life of the brother whom he killed. Then we will cut off the heir as well!’ So they would extinguish my one remaining ember by not preserving my husband’s name or posterity on the earth.”

Context

5Eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ mkpa gị?” Ọ zara sị, “Abụ m nwanyị isi mkpe, di m anwụọla. 6Enwere m ụmụ ndị ikom abụọ ndị gara lụọ ọgụ nʼọhịa. Mgbe ha na-alụ ọgụ ahụ, o nweghị onye pụtara gboo ha. Nʼihi ya, otu nʼime ha tigburu ibe ya. 7Ma ugbu a, ndị ikwu di m na-esogbu m na-asị ‘Kpọpụta onye ahụ gburu nwanne ya ka anyị gbuo ya nʼihi ndụ nwanne ya o wepụrụ, ka anyị si otu a memilaa onye nke fọdụrụ ga-erita oke ezinaụlọ.’ Ha chọrọ isi otu a menyụọ icheku ọkụ nke fọdụụrụ m, nke bụ na di m agaghị enwezikwa aha maọbụ onye fọdụụrụ ya nʼelu ụwa.” 8Eze sịrị nwanyị ahụ, “Laa nʼụlọ gị, aga m ahụ na o nweghị onye metụrụ ya aka.” 9Ma nwanyị ahụ si Tekoa sịrị ya, “Ka onyenwe m, bụ eze, gbaghara mụ na ezinaụlọ m, ka ikpe ọmụma ọbụla ghara ịdịrị eze na ocheeze ya.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.