2 Samuel 13:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Devid kwenyere, zie Tama ka ọ gaa nʼụlọ Amnọn gaa siere ya nri.
2 Samuel 13:7 in English
2 Samuel 13:7 · Berean Standard Bible
Then David sent word to Tamar at the palace: “Please go to the house of Amnon your brother and prepare a meal for him.”
Context
5Jonadab gwara ya sị, “Ọ dị mma. Lee ihe ị ga-eme. Gaa dinaa ala, dịka a ga-asị na ahụ adịghị gị. Mgbe nna gị bịara ileta gị, gwa ya okwu sị ya, ‘Achọrọ m ka nwanne m nwanyị bụ Tama bịa nye m ihe oriri. Achọrọ m ka ọ nọdụ nʼihu m sie nri ahụ, mgbe m na-ele ya anya, ka o jirikwa aka ya nye m nri ahụ.’ ” 6Amnọn mere otu a. Mgbe eze bịara ileta ya, Amnọn rịọrọ ya sị, “Biko, ka Tama bịa ebe a gheere m achịcha ole na ole ebe m ga-ahụ ya anya. Ka o jirikwa aka ya dozie ya nʼihu m ka m rie ya.” 7Devid kwenyere, zie Tama ka ọ gaa nʼụlọ Amnọn gaa siere ya nri. 8Tama gara nʼụlọ Amnọn, banyekwa nʼime ụlọ ebe o dinaa, ka Amnọn na-ele ya anya mgbe ọ na-agwọgharị ụtụ ọka. Emesịa, Tama gheere ya achịcha mara mma. 9Mgbe o cheziri achịcha ahụ nʼihu Amnọn, Amnọn jụrụ iri ya.
Ihe o mere mgbe ahụ bụ inye ndị na-ejere ya ozi nọ nʼebe ahụ iwu sị ha niile pụọ ngwangwa. Ha niile pụkwara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.