2 Samuel 13:34
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Absalọm gbara ọsọ gbalaga. Ọ dịghị anya nwoke na-anọ nʼelu mgbidi Jerusalem na-eche nche, lepụrụ anya hụ ndị mmadụ ka ha si nʼụzọ dị nʼakụkụ ugwu nta na-abịa. Nwoke ahụ gara gwa eze sị ya, “Ahụrụ m ndị si nʼakụkụ Horonaim, nʼakụkụ ugwu na-abịa.”
2 Samuel 13:34 in English
2 Samuel 13:34 · Berean Standard Bible
Meanwhile, Absalom had fled. When the young man standing watch looked up, he saw many people coming down the road west of him,* along the side of the hill. And the watchman went and reported to the king, “I see men coming from the direction of Horonaim, along the side of the hill.”*
Context
32Ma Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid, sịrị, “Onyenwe m, echekwala na e gburu ụmụ ndị ikom eze niile, kama ọ bụ naanị Amnọn! Nke a bụ ihe Absalọm jikere ime site mgbe Amnọn wakporo nwanne ya nwanyị bụ Tama, dina ya. 33Ma ugbu a, ka onyenwe m bụ eze ghara itinye akụkọ banyere ọnwụ ụmụ ndị ikom eze niile, nʼobi ya. Ọ bụ naanị Amnọn nwụrụ.” 34Ma Absalọm gbara ọsọ gbalaga.
Ọ dịghị anya nwoke na-anọ nʼelu mgbidi Jerusalem na-eche nche, lepụrụ anya hụ ndị mmadụ ka ha si nʼụzọ dị nʼakụkụ ugwu nta na-abịa. Nwoke ahụ gara gwa eze sị ya, “Ahụrụ m ndị si nʼakụkụ Horonaim, nʼakụkụ ugwu na-abịa.” 35Jonadab gwara eze sị, “Lee, ọ bụ ụmụ ndị ikom eze na-alọta dịka m kwuru.” 36Mgbe ha lọbatara, ha bidoro ịkwa akwa nke ukwuu. Eze na ndị na-ejere ya ozi sokwa kwaa akwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.