2 Samuel 13:28
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Absalọm nyere ndị na-ejere ya ozi iwu banyere Amnọn sị, “Cherenụ ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, mgbe m sịkwara unu tigbuo ya, unu atụla egwu, tigbuonụ ya. Ọ bụ m na-ekwu ihe ga-eme nʼebe a. Nweenụ obi ike, meekwanụ ya.”
2 Samuel 13:28 in English
2 Samuel 13:28 · Berean Standard Bible
Now Absalom had ordered his young men, “Watch Amnon until his heart is merry with wine, and when I order you to strike Amnon down, you are to kill him. Do not be afraid. Have I not commanded you? Be courageous and valiant!”
Context
26Mgbe ahụ, Absalọm rịọrọ nna ya sị, “Ọ dị mma, ọ bụrụ na ị gaghị abịa, ị ga-emekwa ka nwanna m nwoke Amnọn, na ụmụ eze ndị ọzọ bịa?”
Eze jụrụ ya sị, “Nʼihi gịnị ka Amnọn ga-eji soro gị gaa?” 27Ma Absalọm rụgidere ya, ya mere o zipụrụ Amnọn na ụmụ eze ndị ọzọ ka ha soro ya gaa. 28Mgbe ahụ, Absalọm nyere ndị na-ejere ya ozi iwu banyere Amnọn sị, “Cherenụ ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, mgbe m sịkwara unu tigbuo ya, unu atụla egwu, tigbuonụ ya. Ọ bụ m na-ekwu ihe ga-eme nʼebe a. Nweenụ obi ike, meekwanụ ya.” 29Mgbe oge ruru, ndị ozi Absalọm tigburu Amnọn. Mgbe ahụ, ụmụ eze niile biliri makwasị nʼịnyịnya ha gbalaga. 30Mgbe ha ka nọ nʼụzọ na-agbaga Jerusalem, ozi eruolarị Devid ntị sị, “Absalọm egbuchaala ụmụ eze niile, ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.