2 Samuel 13:23
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe afọ abụọ gasịrị, mgbe ndị na-akpụchara Absalọm ajị ụmụ atụrụ ya nọ na Baal-Hazọ, nʼoke ala Ifrem, ọ kpọkọtara ụmụ ndị ikom eze niile ka ha bịa nʼebe ahụ.
2 Samuel 13:23 in English
2 Samuel 13:23 · Berean Standard Bible
Two years later, when Absalom’s sheepshearers were at Baal-hazor near Ephraim, he invited all the sons of the king.
Context
21Mgbe eze Devid nụrụ ihe ndị a niile, iwe were ya nke ukwuu. 22Absalọm agwaghị Amnọn okwu ọbụla, maọbụ nke dị mma, maọbụ okwu ọjọọ. Ma ọ kpọrọ Amnọn asị nke ukwuu nʼihi ọnọdụ iweda nʼala o wedara nwanne ya Tama, mee ya ihe ihere. 23Mgbe afọ abụọ gasịrị, mgbe ndị na-akpụchara Absalọm ajị ụmụ atụrụ ya nọ na Baal-Hazọ, nʼoke ala Ifrem, ọ kpọkọtara ụmụ ndị ikom eze niile ka ha bịa nʼebe ahụ. 24Absalọm jekwuuru eze sị ya, “Ndị na-akpụcha ajị ụmụ atụrụ ohu gị bịara. Eze na ndịisi ozi ya, ha ga-abịa sonyere m?” 25Ma eze zara sị ya, “Mba, nwa m, anyị niile agaghị abịa, anyị ga-abụ ibu dị arọ nye gị.” Nʼagbanyeghị na Absalọm rugidere ya ma o kweghị aga, kama ọ gọziri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.