Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Amnọn egeghị ntị. Ebe ọ bụ na ọ ka Tama ike, o jidere ya dinaa ya nʼike merụọ ya.

2 Samuel 13:14 in English

2 Samuel 13:14 · Berean Standard Bible

But Amnon refused to listen to her, and being stronger, he violated her and lay with her.

Context

12Tama zara sị ya, “Mba! Nwanne m nwoke. Emerụla m. Ihe dị otu a ekwesighị ime nʼala Izrel. Emela ihe ọjọọ dị otu a. 13Olee ihe ga-abụ ọnọdụ m? Oleekwanụ ihe ga-abụ ọnọdụ gị? Olee ebe m ga-agbala izo onwe m nʼihi ihe ihere ga-adịrị m ma i mee ihe dị otu a? Ị ga-adị ka otu nʼime ndị nzuzu ọjọọ dị nʼIzrel. Biko, gwa eze, ọ ga-ekwe ka ị lụọ m.” 14Ma Amnọn egeghị ntị. Ebe ọ bụ na ọ ka Tama ike, o jidere ya dinaa ya nʼike merụọ ya. 15Emesịa, Amnọn kpọrọ Tama asị. Nʼezie, ọ kpọrọ ya asị ugbu a karịa ịhụnanya ọ hụrụ ya na mbụ. Ọ gwara Tama okwu sị ya, “Bilie si nʼebe a pụọ ọsịịsọ!” 16Ma Tama kwara akwa sị ya, “Mba! Ịjụ m otu a ka njọ karịa ihe ọjọọ i mere m.” Ma Amnọn egeghị ya ntị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.