Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid kasiri Batsheba nwunye ya obi, emesịa, mgbe ya na ya dinakọrọ, ọ tụụrụ ime ọzọ mụọ nwa nwoke onye ha kpọrọ aha ya Solomọn. Ma Onyenwe anyị hụrụ nwantakịrị ahụ nʼanya.

2 Samuel 12:24 in English

2 Samuel 12:24 · Berean Standard Bible

Then David comforted his wife Bathsheba, and he went to her and lay with her. So she gave birth to a son, and they * named him Solomon. Now the LORD loved the child

Context

22Devid zara ha sị, “Eburu m ọnụ, kwaakwa akwa mgbe nwa ahụ nọ ndụ, nʼihi na ekwuru m sị, ‘ma eleghị anya, Onyenwe anyị ga-enwe ọmịiko nʼebe m nọ mee ka nwa ahụ dị ndụ.’ 23Ma ugbu a ọ nwụrụ, gịnịkwa ka m nwere dịka uru ibu ọnụ ọzọ? M pụrụ ime ka ọ dị ndụ ọzọ? Aga m alakwuru ya, ma ọ gaghị alaghachikwutekwa m.” 24Devid kasiri Batsheba nwunye ya obi, emesịa, mgbe ya na ya dinakọrọ, ọ tụụrụ ime ọzọ mụọ nwa nwoke onye ha kpọrọ aha ya Solomọn. Ma Onyenwe anyị hụrụ nwantakịrị ahụ nʼanya. 25O zigara ozi site nʼaka Netan, onye amụma, ka a gụọ ya Jedidaya nʼihi Onyenwe anyị. 26Nʼoge a, Joab busoro Raba obodo ndị Amọn agha dọta isi obodo eze ha nʼagha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.