Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Devid hụrụ na ha na-ekwurịta okwu nʼetiti onwe ha na nzuzo; ọ matara na nwa ahụ anwụọla. Ọ jụrụ ha sị, “Nwata ahụ ọ nwụọla?” Ha zara sị ya, “E, ọ nwụọla!”

2 Samuel 12:19 in English

2 Samuel 12:19 · Berean Standard Bible

When David saw that his servants were whispering to one another, he perceived that the child was dead. So he asked his servants, “Is the child dead?” “He is dead,” they replied.

Context

17Emesịa, ndị okenye ụlọ ya rịọrọ Devid ka o bilie rie nri, ma ọ jụrụ iri ihe ọbụla. 18Nʼụbọchị nke asaa, nwantakịrị ahụ nwụrụ. Mgbe ahụ, ndị na-ejere Devid ozi tụrụ egwu otu ha ga-esi gwa ya na nwantakịrị ahụ anwụọla. Nʼihi na ha kwuru nʼime onwe ha sị, “Mgbe nwantakịrị ahụ ka dị ndụ, anyị gwara ya okwu ma o geghị anyị ntị. Anyị ga-esi aṅaa gwa ya na nwantakịrị ahụ anwụọla? O nwere ike imerụ onwe ya ahụ.” 19Mgbe Devid hụrụ na ha na-ekwurịta okwu nʼetiti onwe ha na nzuzo; ọ matara na nwa ahụ anwụọla. Ọ jụrụ ha sị, “Nwata ahụ ọ nwụọla?” Ha zara sị ya, “E, ọ nwụọla!” 20Mgbe ahụ, Devid sitere nʼala ebe o dina, bilie, saa ahụ, gbanwee uwe ya, baa nʼụlọ Onyenwe anyị, kpọọrọ ya isiala. Ọ lọghachiri nʼụlọ ya nye iwu ka e wetara ya ihe oriri. O rikwara nri. 21O juru ndị na-ejere ya ozi anya, nʼihi ya ha jụrụ ya ajụjụ si, “Gịnị mere i ji eme omume dị otu a? Mgbe nwantakịrị ahụ nọ ndụ, i buru ọnụ, kwaakwa akwa, ma ugbu a, nwa ahụ anwụọla, ị kwụsịla iru ụjụ. Ugbu a, ị biliela na-erikwa nri.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.