2 Samuel 12:16
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Devid rịọrọ Chineke arịrịọ banyere nwantakịrị ahụ. O buru ọnụ, dinaa nʼala efu abalị ahụ niile nʼihu Onyenwe anyị.
2 Samuel 12:16 in English
2 Samuel 12:16 · Berean Standard Bible
David pleaded with God for the boy. He fasted and went into his house and spent the night lying in sackcloth * on the ground.
Context
14Ma nʼihi na i meela ka ndị iro Onyenwe anyị nwe ohere ikwulu na ilelị ya anya, nwa nwoke ahụ amụụrụ gị ga-anwụ.” 15Mgbe Netan lara, Onyenwe anyị mere ka nwantakịrị ahụ nwunye Ụraya mụụrụ Devid daa ọrịa. 16Devid rịọrọ Chineke arịrịọ banyere nwantakịrị ahụ. O buru ọnụ, dinaa nʼala efu abalị ahụ niile nʼihu Onyenwe anyị. 17Emesịa, ndị okenye ụlọ ya rịọrọ Devid ka o bilie rie nri, ma ọ jụrụ iri ihe ọbụla. 18Nʼụbọchị nke asaa, nwantakịrị ahụ nwụrụ. Mgbe ahụ, ndị na-ejere Devid ozi tụrụ egwu otu ha ga-esi gwa ya na nwantakịrị ahụ anwụọla. Nʼihi na ha kwuru nʼime onwe ha sị, “Mgbe nwantakịrị ahụ ka dị ndụ, anyị gwara ya okwu ma o geghị anyị ntị. Anyị ga-esi aṅaa gwa ya na nwantakịrị ahụ anwụọla? O nwere ike imerụ onwe ya ahụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.