Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼotu uhuruchi, Devid sitere nʼihe ndina ya bilie, gagharịa nʼelu ụlọeze ya. Ọ sitere nʼelu ụlọ ahụ hụ otu nwanyị na-asa ahụ. Nwanyị ahụ mara mma nke ukwu nʼile anya.

2 Samuel 11:2 in English

2 Samuel 11:2 · Berean Standard Bible

One evening David got up from his bed and strolled around on the roof of the palace. And from the roof he saw a woman bathing—a very beautiful woman.

Context

1Nʼoge ọkọchị, mgbe ndị eze na-apụ ibu agha, Devid zipụrụ Joab ọchịagha ya, na ndị agha Izrel. Ha bibiri ndị Amọn, nọchibidokwa Raba. Ma Devid nọdụrụ na Jerusalem. 2Nʼotu uhuruchi, Devid sitere nʼihe ndina ya bilie, gagharịa nʼelu ụlọeze ya. Ọ sitere nʼelu ụlọ ahụ hụ otu nwanyị na-asa ahụ. Nwanyị ahụ mara mma nke ukwu nʼile anya. 3Devid ziri ozi ka a jụta onye nwanyị ahụ bụ, ma a gwara ya na ọ bụ Batsheba, nwa Eliam, nwunye Ụraya onye Het. 4Devid ziri ka a gaa kpọta ya. Mgbe ọ bịara, ya na Devid dinara. (Ka ọ ghụchasịrị onwe ya site nʼadịghị ọcha ya nke ọnwa ahụ.) Ọ laghachiri nʼụlọ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.