Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, Devid kpọrọ ya oriri, meekwa ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke, ma nke a emeghị ka ọ laa nʼụlọ ya nʼabalị ahụ, kama ọ bụkwa nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze ka o dinara nʼetiti ndị na-ejere eze ozi.

2 Samuel 11:13 in English

2 Samuel 11:13 · Berean Standard Bible

Then David invited Uriah to eat and drink with him, and he got Uriah drunk. And in the evening Uriah went out to lie down on his cot with his master’s servants, but he did not go home.

Context

11Ụraya zara Devid, “Lee, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na Izrel na Juda niile nọ nʼụlọ ikwu. Nna m ukwu Joab na ndị agha nna m ukwu nọ nʼọhịa. M ga-esi aṅaa laa nʼụlọ m, iri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ na isoro nwunye m dinaa? Ana m aṅụ iyi na agaghị m eme ihe dị otu a.” 12Devid gwara ya sị, “Ọ dị mma, nọdụ nʼebe a taa, echi ị ga-alaghachikwa nʼọgbọ agha.” Ụraya kwenyere nọdụ na Jerusalem ụbọchị ahụ, nakwa ụbọchị na-eso ya. 13Emesịa, Devid kpọrọ ya oriri, meekwa ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke, ma nke a emeghị ka ọ laa nʼụlọ ya nʼabalị ahụ, kama ọ bụkwa nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze ka o dinara nʼetiti ndị na-ejere eze ozi. 14Nʼụtụtụ echi ya, Devid degaara Joab akwụkwọ, zighachịkwa ya site nʼaka Ụraya. 15Ihe ọ dere nʼakwụkwọ ahụ bụ nke a, “Tinye Ụraya nʼihu agha ebe ọgụ siri ike. Mgbe ndị iro na-apụkwute unu, laanụ azụ, ma hapụnụ Ụraya nʼihu ọgụ ka ndị iro gbuo ya.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.