2 Samuel 11:10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe a gwara Devid na Ụraya alaghị nʼụlọ ya, Devid kpọrọ Ụraya, jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụghị ije dị anya ka i si lọta? Gịnị mere ị larughị nʼụlọ gị?”
2 Samuel 11:10 in English
2 Samuel 11:10 · Berean Standard Bible
And David was told, “Uriah did not go home.” “Haven’t you just arrived from a journey?” David asked Uriah. “Why didn’t you go home?”
Context
8Devid sịrị Ụraya, “Laa nʼụlọ gị gaa saa ụkwụ gị.” Ụraya si nʼụlọeze pụọ. E zipụkwara onyinye nke ndị na-ejere eze ozi ji sochie ya azụ. 9Ma Ụraya agaghị nʼụlọ ya. Kama o so ndị na-ejere eze ozi dinaa nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze. 10Mgbe a gwara Devid na Ụraya alaghị nʼụlọ ya, Devid kpọrọ Ụraya, jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụghị ije dị anya ka i si lọta? Gịnị mere ị larughị nʼụlọ gị?” 11Ụraya zara Devid, “Lee, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na Izrel na Juda niile nọ nʼụlọ ikwu. Nna m ukwu Joab na ndị agha nna m ukwu nọ nʼọhịa. M ga-esi aṅaa laa nʼụlọ m, iri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ na isoro nwunye m dinaa? Ana m aṅụ iyi na agaghị m eme ihe dị otu a.” 12Devid gwara ya sị, “Ọ dị mma, nọdụ nʼebe a taa, echi ị ga-alaghachikwa nʼọgbọ agha.” Ụraya kwenyere nọdụ na Jerusalem ụbọchị ahụ, nakwa ụbọchị na-eso ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.