Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ndị eze niile nọ nʼokpuru ọchịchị Hadadeza hụrụ na Izrel etigbuola ha, ha mere ka ha na ndị Izrel dịrị nʼudo, bụrụkwa ndị nọ nʼokpuru ha. Ya mere, ndị Aram tụrụ egwu inyere ụmụ Amọn aka ọzọ. 10:1 Ndị Amọn bụ mba na-ebi nʼọzara, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke osimiri Jọdan.

2 Samuel 10:19 in English

2 Samuel 10:19 · Berean Standard Bible

When all the kings who were subject to Hadadezer saw that they had been defeated by Israel, they made peace with Israel and became subject to them. So the Arameans were afraid to help the Ammonites anymore.

Context

17Mgbe a gwara Devid banyere nke a, ọ chịkọtara ndị Izrel niile, gafee Jọdan, jeruo Hilam. Ndị Aram doro usoro agha ha izute Devid, lụsokwaa ya agha. 18Ma ha sitere nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ, Devid gburu narị ndị ikom asaa na-anya ụgbọ agha nke ịnyịnya na-adọkpụ. Gbukwaa iri puku ndị agha anọ na-eji ụkwụ eje. O tidara Shobak, bụ ọchịagha ndị agha ha, ọ nwụọ nʼebe ahụ. 19Mgbe ndị eze niile nọ nʼokpuru ọchịchị Hadadeza hụrụ na Izrel etigbuola ha, ha mere ka ha na ndị Izrel dịrị nʼudo, bụrụkwa ndị nọ nʼokpuru ha. Ya mere, ndị Aram tụrụ egwu inyere ụmụ Amọn aka ọzọ. 10:1 Ndị Amọn bụ mba na-ebi nʼọzara, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke osimiri Jọdan.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.