Native Bible

2 Peter 2:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

(nʼihi na nwoke ezi omume ahụ nke na-ebi nʼetiti ha ụbọchị niile, ehihie na abalị, bụ onye eji ọrụ mmebi iwu niile ọ na-anụ, na nke o ji anya ya na-ahụ, mekpaa mkpụrụobi ezi omume ya ahụ).

2 Peter 2:8 in English

2 Peter 2:8 · Berean Standard Bible

(for that righteous man, living among them day after day, was tormented in his righteous soul by the lawless deeds he saw and heard)—

Context

6Ọ bụrụ na ọ mara obodo Sọdọm na Gọmọra ikpe site nʼiwere ọkụ rechapụ ha, mee ha ihe ịmaatụ banyere ihe gaje ịbịakwasị ndị na-amaghị Chineke; 7ọ bụrụkwa na ọ napụtara Lọt bụ onye ezi omume, onye ndụ ọjọọ nke ndị na-emebi iwu wutere 8(nʼihi na nwoke ezi omume ahụ nke na-ebi nʼetiti ha ụbọchị niile, ehihie na abalị, bụ onye eji ọrụ mmebi iwu niile ọ na-anụ, na nke o ji anya ya na-ahụ, mekpaa mkpụrụobi ezi omume ya ahụ). 9Ọ bụrụ na ọ dị otu a, Onyenwe anyị maara otu o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke site nʼọnwụnwa niile gbara ha gburugburu. Ọ makwaara edebe ndị ajọ omume nʼahụhụ, tutu ruo ụbọchị ikpe ahụ. 10Nke a bụ eziokwu banyere ndị ahụ na-agbaso ọchịchọ emerụrụ emerụ nke anụ ahụ mmehie ha, na-eledakwa ike ọchịchị anya. Ndị nwere anya ike ma jupụtakwa na mpako. Ndị ahụ ụjọ na-adịghị atụ ikwutọ ọ bụladị mmụọ ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.