2 Pita 2:18
2 Peter 2:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-eji okwu efu na-enweghị isi, na agụụ ihe ọjọọ nke na-agụ anụ ahụ ha, na-arafu ndị sitere nʼetiti ndị na-ebi ndụ ọjọọ na-ekewapụ onwe ha.
2 Peter 2:18 in English
2 Peter 2:18 · Berean Standard Bible
With lofty but empty words, they appeal to the sensual passions of the flesh and entice those who are just escaping from others who live in error.
Context
16Ma a baara ya mba maka ajọ omume ya, mgbe e mere ka ịnyịnya ibu ya jiri olu mmadụ gwa ya okwu; gbochie ọrụ onyeisi na-adịghị mma nke onye amụma ahụ chọrọ ịrụ. 17Ndị a dịkwa ka iyi tara ata nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha dịkwa ka igwe ojii nke oke ifufe na-efesasị, nke na-adịghị ezo mmiri ọbụla. Ndị a kwadobere ebe kachasị ịgba ọchịchịrị. 18Ha na-eji okwu efu na-enweghị isi, na agụụ ihe ọjọọ nke na-agụ anụ ahụ ha, na-arafu ndị sitere nʼetiti ndị na-ebi ndụ ọjọọ na-ekewapụ onwe ha. 19Ha na-ekwe ha nkwa inwere onwe ha, ma ha onwe ha bụ ohu nye ihe rere ure, nʼihi na mmadụ bụ ohu nye ihe ọbụla na-achị achị nʼime ya. 20Mgbe ha sitere nʼihe niile emerụrụ emerụ nke ụwa gbapụ, site na mmazu nke Onyenwe anyị, na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, bụrụ ndị atụhịrị na mmehie ọzọ, bụrụkwa ndị e meriri, ha ga-abụ ndị ọnọdụ ha ga-ajọ njọ karịa ka ọ dị na mbụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.