2 Pita 1:2
2 Peter 1:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka amara na udo bara unu ụba, site na mmazu nke Chineke na nke Jisọs Onyenwe anyị.
2 Peter 1:2 in English
2 Peter 1:2 · Berean Standard Bible
Grace and peace be multiplied to you through the knowledge of God and of Jesus our Lord.
Context
1Ọ bụ Saimọn Pita, odibo na onyeozi nke Jisọs Kraịst,
Na-edegara ndị niile anyị na ha ketara otu ụdị okwukwe a dị oke ọnụahịa, nʼime ezi omume nke Chineke na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst akwụkwọ ozi a: 2Ka amara na udo bara unu ụba, site na mmazu nke Chineke na nke Jisọs Onyenwe anyị. 3O sitela nʼike o ji bụrụ Chi nye anyị ihe niile dị anyị mkpa ibi ndụ na-asọpụrụ ya, site nʼọmụma nke anyị mara ya, bụ onye ahụ kpọrọ anyị site nʼebube ya na ịdị mma ya. 4O sitela nʼihe ndị a nye anyị nkwa dị ukwuu na nke dị oke ọnụahịa, ka anyị site na ha keta oke nʼụdịdị nsọ ya, si otu a gbanarị ịrụ arụ dị nʼụwa, nke ọchịchọ ọjọọ na-ebute.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.