2 Ndị Eze 9:24
2 Kings 9:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jehu jiri ike ya niile dọtịa ụta o ji nʼaka ya gba ya Joram. Ọ gbatara Joram àkụ ahụ nʼazụ. Àkụ ahụ sikwa ya nʼobi pụta. Nke a mere ka Joram daa nʼime ụgbọala ya nwụọ.
2 Kings 9:24 in English
2 Kings 9:24 · Berean Standard Bible
Then Jehu drew his bow and shot Joram between the shoulders. The arrow pierced his heart, and he slumped down in his chariot.
Context
22Mgbe Joram hụrụ Jehu, ọ jụrụ, “Ị bịara nʼudo? Udo ọ dịkwa, Jehu?”
Jehu zara, “Olee otu udo ga-esi dịrị, ebe ọ bụ na ihe ọjọọ niile nke ikpere arụsị na mgbaasị nke Jezebel nne gị, jupụtara nʼebe niile.” 23Joram chigharịrị ụgbọ agha ya bido ịgba ọsọ. Mgbe ọ na-agba ọsọ, o tiri mkpu kpọkuo Ahazaya sị ya, “Ahazaya, Aghụghọ dị, ọgbaaghara dị!” 24Jehu jiri ike ya niile dọtịa ụta o ji nʼaka ya gba ya Joram. Ọ gbatara Joram àkụ ahụ nʼazụ. Àkụ ahụ sikwa ya nʼobi pụta. Nke a mere ka Joram daa nʼime ụgbọala ya nwụọ. 25Mgbe ahụ, Jehu sịrị Bidka, bụ onyeisi agha ya, “Bulie ya, tụba ya nʼubi Nebọt onye Jezril. Chetakwa na mụ na gị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya, anyị abụọ, na-eso nna ya Ehab, mgbe Onyenwe anyị kwuru okwu amụma a megide ya. 26‘Nʼezie, ahụrụ m ọbara Nebọt na ọbara ụmụ ya ndị ikom ụnyaahụ, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, nʼihi ya, aghaghị m ime ka ị kwụghachi ụgwọ ọbara ha nʼala ubi a.’ Ugbu a, bulie ya tụba ya nʼala ubi a dị ka okwu Onyenwe anyị si dị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.