Native Bible

2 Kings 8:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe nwanyị ahụ bịakwutere eze, eze nọ na-agwa Gehazi bụ onye na-ejere onye nke Chineke ozi okwu sị ya, “Biko, kọọrọ m akụkọ ihe ukwu niile Ịlaisha mere.”

2 Kings 8:4 in English

2 Kings 8:4 · Berean Standard Bible

Now the king had been speaking to Gehazi, the servant of the man of God, saying, “Please relate to me all the great things Elisha has done.”

Context

2Nwanyị ahụ mere dịka onye nke Chineke gwara ya, o biliri, ya na ezinaụlọ ya gaa biri nʼala ndị Filistia* afọ asaa. 3Mgbe ụnwụ ahụ gwụsịrị nʼafọ nke asaa, o si nʼala ndị Filistia lọta nʼIzrel. Mgbe ọ lọtara, o jekwuuru eze ka o nyere ya aka inwetaghachi ụlọ ya na ala ya. 4Mgbe nwanyị ahụ bịakwutere eze, eze nọ na-agwa Gehazi bụ onye na-ejere onye nke Chineke ozi okwu sị ya, “Biko, kọọrọ m akụkọ ihe ukwu niile Ịlaisha mere.” 5Mgbe Gehazi na-akọrọ eze otu Ịlaisha si mee ka nwantakịrị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ, nwanyị ahụ, onye bụ nne nwantakịrị ahụ, batara nʼime ụlọeze. Mgbe ahụ, Gehazi kwuru sị, “Onyenwe m eze, onye a bụ nwanyị ahụ, leekwa nwa ya nwoke, onye Ịlaisha mere ka ọ dị ndụ ọzọ.” 6Eze jụrụ nwanyị ahụ ajụjụ sị ya, “Ọ bụ eziokwu?” Nwanyị ahụ kọọrọ eze akụkọ ihe niile mere. Mgbe ahụ, eze dunyere ya otu onyeisi nʼime ndị ozi ya ka o nyere ya aka inwetaghachi ihe ya niile, ya na ụgwọ ruru ya nʼihi mkpụrụ ubi ya niile ha ghọrọ mgbe ahụ o bi nʼala ndị Filistia.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.