Native Bible

2 Kings 8:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼoge Jehoram bụ eze, ka Edọm si nʼokpuru Juda nupu isi, họpụtara onwe ha eze.

2 Kings 8:20 in English

2 Kings 8:20 · Berean Standard Bible

In the days of Jehoram,* Edom rebelled against the hand of Judah and appointed their own king.

Context

18O soro ụzọ ndị eze Izrel dịka ụlọ Ehab mere, nʼihi na ọ lụrụ ada Ehab. O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. 19Ma nʼagbanyeghị nke a, nʼihi ohu ya bụ Devid Onyenwe anyị achọghị ibibi Juda. Nʼihi na o kwere nkwa ime ka oriọna dịịrị Devid na ụmụ ụmụ ruo mgbe ebighị ebi. 20Nʼoge Jehoram bụ eze, ka Edọm si nʼokpuru Juda nupu isi, họpụtara onwe ha eze. 21Ya mere, Jehoram* duuru ụgbọ agha ya niile gaa nʼobodo Zaịa. O biliri nʼabalị tigbuo ndị Edọm ahụ gbara ya na ndị ọchịagha ụgbọ agha ya gburugburu; ma ndị agha ya gbaghachiri azụ, laa nʼụlọ ha. 22Ya mere, Edọm ka na-enupu isi megide Juda, ruo taa. Obodo Libna nupukwara isi nʼotu oge ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.