Native Bible

2 Kings 8:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼafọ nke ise nke ọchịchị Joram nwa Ehab eze Izrel, mgbe Jehoshafat bụ eze Juda, ka Jehoram nwa Jehoshafat malitere ọchịchị ya dịka eze Juda.

2 Kings 8:16 in English

2 Kings 8:16 · Berean Standard Bible

In the fifth year of the reign of Joram son of Ahab over Israel, Jehoram son of Jehoshaphat succeeded his father as king of Judah.

Context

14Mgbe Hazael, si nʼebe Ịlaisha nọ laa, ọ bịakwutere nna ya ukwu. Mgbe Ben-Hadad jụrụ ya sị, “Gịnị ka Ịlaisha gwara gị?” Hazael zara sị, “Ọ gwara m na ị ga-esi nʼọrịa bilie.” 15Ma nʼechi ya, Hazael chịịrị akwa na-egbo oyi, banye ya na mmiri jiri ya baa nʼebe eze dina, gbasaa ya nʼihu eze, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ. Emesịa, Hazael ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 16Nʼafọ nke ise nke ọchịchị Joram nwa Ehab eze Izrel, mgbe Jehoshafat bụ eze Juda, ka Jehoram nwa Jehoshafat malitere ọchịchị ya dịka eze Juda. 17Ọ dị iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị afọ asatọ na Jerusalem. 18O soro ụzọ ndị eze Izrel dịka ụlọ Ehab mere, nʼihi na ọ lụrụ ada Ehab. O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.