Native Bible

2 Kings 7:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, ha họpụtara ụgbọ agha abụọ na ịnyịnya ndị na-adọkpụ ha. Eze zipụrụ ha ịchụso ndị agha Aram, O nyere ndị na-agba ha iwu sị, “Gaanụ chọpụta ihe mere.”

2 Kings 7:14 in English

2 Kings 7:14 · Berean Standard Bible

Then the scouts took two chariots with horses, and the king sent them after the Aramean army, saying, “Go and see.”

Context

12Eze biliri nʼabalị ahụ gwa ndịisi ọrụ ya sị, “Ka m gwa unu ihe ndị Aram mere anyị. Ha maara na anyị nọ nʼoke agụụ, nʼihi ya, ha akpacharala anya hapụ ọmụma ụlọ ikwu ha gaa zoo onwe ha nʼime ọhịa. Echiche ha bụ, ‘Ndị a ga-apụtarịrị, mgbe ahụ, anyị ga-ejide ha na ndụ, banyekwa nʼime obodo ha.’ ” 13Ma otu onye nʼime ndịisi agha ya zara sị ya, “Ka ụfọdụ mmadụ duru ịnyịnya ise ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo. Ọ bụrụ na ndị a alọtaghị ọnọdụ ha ga-adị ka nke ndị Izrel niile fọdụrụ nʼebe, e, ha ga-adị ka ndị Izrel niile a gụrụ dịka ndị nwụrụ anwụ. Ya mere, ka anyị zipụ ha ka ha gaa chọpụta ihe mere.” 14Ya mere, ha họpụtara ụgbọ agha abụọ na ịnyịnya ndị na-adọkpụ ha. Eze zipụrụ ha ịchụso ndị agha Aram, O nyere ndị na-agba ha iwu sị, “Gaanụ chọpụta ihe mere.” 15Ha sogidere ha ruo nʼosimiri Jọdan. Nʼakụkụ ụzọ niile jupụtara nʼuwe na ngwa agha ndị agha Aram tufuru mgbe ha na-eme ngwangwa. Ndị ahụ e zipụrụ lọghachiri bịa kọọrọ eze ihe ha hụrụ. 16Ndị Izrel niile pụrụ gaa kwakọrọ ihe dị nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Aram. Nke bụ na e rere otu akpa nta ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma otu shekel, rekwaa akpa ọka balị abụọ otu shekel dịka Onyenwe anyị si kwuo.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.