Native Bible

2 Kings 6:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ sịrị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na isi Ịlaisha nwa Shafat anọgide nʼahụ ya taa.”

2 Kings 6:31 in English

2 Kings 6:31 · Berean Standard Bible

He announced, “May God punish me, and ever so severely, if the head of Elisha son of Shaphat remains on his shoulders through this day!”

Context

29Ya mere, na anyị siri nwa m rie ya. Nʼụbọchị nke so ya asịrị m ya, ‘Wepụta nwa gị nwoke ka anyị rie ya,’ ma o zoola ya.” 30Mgbe eze nụrụ okwu nwanyị a, ọ dọwara uwe ya. Ma dịka ọ na-agabiga nʼelu mgbidi ahụ, ndị mmadụ lere anya hụ nʼokpuru uwe, akwa mkpe dị nʼime ahụ ya. 31Ọ sịrị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na isi Ịlaisha nwa Shafat anọgide nʼahụ ya taa.” 32Nʼoge a, Ịlaisha nọdụrụ ala nʼụlọ ya, ndị okenye sokwa ya nọdụ. Eze zipụrụ onyeozi, ma tupu o rute, Ịlaisha gwara ndị okenye ahụ okwu sị ha, “Unu ahụla na ogbu mmadụ a ezitela mmadụ ka ọ bịa gbupụ m isi. Mgbe onyeozi ya bịaruru, mechienụ ụzọ hapụ ya nʼezi, nʼihi na eze nʼonwe ya ga-eso ya nʼazụ bịa.” 33Mgbe Ịlaisha nọ na-agwa ha okwu, lee onyeozi ahụ ka ọ na-abịakwute ya. Eze sokwa ya nʼazụ na-ekwu okwu na-asị, “Onyenwe anyị emeela ka ihe ọjọọ dị otu a dakwasị anyị. Gịnị mere m ga-eji lee anya inyeaka site nʼaka Onyenwe anyị ọzọ?” 6:8 Nke bụ Ben-Hadad nke abụọ 6:9 Onye a na-akpọ Joram 6:25 Ịnyịnya ibu so nʼanụ ụmụ Izrel na-ekwesighị iri nʼihi na ọ dịghị ọcha. Lev 11:4

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.