2 Ndị Eze 6:18
2 Kings 6:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ndị iro ahụ na-abịaru ya nso, Ịlaisha kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere sị, “Mee ka ìsì kpuo ndị agha niile.” O mekwara ka ìsì kpuo ha, dịka Ịlaisha rịọọrọ.
2 Kings 6:18 in English
2 Kings 6:18 · Berean Standard Bible
As the Arameans came down against him, Elisha prayed to the LORD, “Please strike these people with blindness.” So He struck them with blindness, according to the word of Elisha.
Context
16Ma Ịlaisha zara sị ya, “Atụla egwu, nʼihi na ndị nọnyere anyị dị ọtụtụ karịa ndị nọnyeere ha.” 17Mgbe ahụ, Ịlaisha kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, biko, saghee anya ya abụọ ka ọ hụ.” Onyenwe anyị meghere anya ohu Ịlaisha, mee ka ọ hụ ịnyịnya ọkụ, na ụgbọala ọkụ jupụtara nʼugwu dị gburugburu ebe ahụ niile. 18Mgbe ndị iro ahụ na-abịaru ya nso, Ịlaisha kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere sị, “Mee ka ìsì kpuo ndị agha niile.” O mekwara ka ìsì kpuo ha, dịka Ịlaisha rịọọrọ. 19Ịlaisha pụtara sị ha, “Nke a abụghị ụzọ, nke a abụkwaghị obodo unu na-achọ. Soronụ m, ka m gosi unu nwoke unu na-achọ.” O duuru ha jee Sameria. 20Mgbe ha bịaruru Sameria, Ịlaisha kpere ekpere sị, “Biko, Onyenwe anyị, ugbu a meghee anya ha, ka ha hụ ụzọ.” Onyenwe anyị meghere anya ha dịka Ịlaisha kpere nʼekpere; ha matakwara na ha nọ na Sameria.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.