2 Ndị Eze 6:14
2 Kings 6:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, nʼotu anyasị eze Aram zigara ọtụtụ ndị agha ya, ndị ji ịnyịnya na ụgbọ agha gbaa obodo ahụ gburugburu.
2 Kings 6:14 in English
2 Kings 6:14 · Berean Standard Bible
the king of Aram sent horses, chariots, and a great army. They went there by night and surrounded the city.
Context
12Otu onye nʼime ndị ọchịagha ya sịrị, “O nweghị onye ọbụla nʼime anyị, onyenwe m bụ eze. Ọ bụ Ịlaisha, onye amụma Izrel, bụ onye na-agwa eze Izrel okwu niile i na-ekwu nʼime ebe ndina gị.” 13Ya mere, eze Aram nyere ha iwu sị ha, “Gaanụ, chọpụta ebe ọ nọ, ka m ziga ndị agha ga-aga jide ya.” Ha gara lọta, kọọrọ ya na Ịlaisha nọ na Dọtan. 14Nʼihi ya, nʼotu anyasị eze Aram zigara ọtụtụ ndị agha ya, ndị ji ịnyịnya na ụgbọ agha gbaa obodo ahụ gburugburu. 15Mgbe onye na-ejere onye nke Chineke ozi biliri ọtọ nʼisi ụtụtụ pụọ, ọ hụrụ ọtụtụ ndị agha na ịnyịnya na ụgbọala, ka ha gbara obodo ha nọ gburugburu. O tiri mkpu sị, “Ewoo, onyenwe m, gịnị ka anyị ga-eme ugbu a?” 16Ma Ịlaisha zara sị ya, “Atụla egwu, nʼihi na ndị nọnyere anyị dị ọtụtụ karịa ndị nọnyeere ha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.