2 Ndị Eze 3:26
2 Kings 3:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe eze Moab hụrụ na agha ahụ anaghị agaziri ya nke ọma, ọ chịịrị narị ndị agha asaa, ndị ji mma agha ebu agha, gbalịa isi nʼetiti ndị agha Izrel tikapụta, na ncherita ihu ebe eze Edọm nọ, ma ha enweghị ike.
2 Kings 3:26 in English
2 Kings 3:26 · Berean Standard Bible
When the king of Moab saw that the battle was too fierce for him, he took with him seven hundred swordsmen to break through to the king of Edom, but they could not prevail.
Context
24Mgbe ha gbaara ọsọ bịaruo nʼụlọ agha ndị Izrel, ndị agha Izrel biliri malite itigbu ha. Ya mere, ndị agha Moab sitere nʼihu ha gbalaga. Ma ndị agha Izrel banyere nʼime obodo ndị Moab, gbuo ihe niile ha hụrụ nʼụzọ. 25Ha tidara obodo ndị Moab niile, tinye nkume nʼala ubi ọma ndị Moab niile. Ha kpọchiri isi mmiri niile, gbudasịakwa ezi osisi niile na-amị mkpụrụ nʼala ahụ. Nʼikpeazụ, ọ bụ naanị otu obodo ndị Moab fọdụrụ, isi obodo a na-akpọ Kia Hareset. Ndị ji ụdọ na-ama nkume gbara obodo a gburugburu, bido ibuso ya agha. 26Mgbe eze Moab hụrụ na agha ahụ anaghị agaziri ya nke ọma, ọ chịịrị narị ndị agha asaa, ndị ji mma agha ebu agha, gbalịa isi nʼetiti ndị agha Izrel tikapụta, na ncherita ihu ebe eze Edọm nọ, ma ha enweghị ike. 27Ya mere, o weere ọkpara ya, onye gaara abụ eze nʼọnọdụ ya, gbuo ya, dịka aja nʼelu mgbidi gbara obodo ahụ gburugburu nye chi Moab. Iwe dị ukwuu dị nʼụbọchị ahụ megide Izrel. Ha kwụsịrị ibu agha, laghachi nʼobodo nke aka ha.
3:8 Ihe nke a pụtara, bụ na ha ga-esi nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Osimiri Nwụrụ anwụ gbaa gburugburu, pụta nʼakụkụ ndịda obodo Moab ma buso ha agha. Ma tupu ha e nwee ike mee otu a, ha ga-esite nʼoke ala ndị Edọm, bụ obodo ndị Juda na-achị gafee.
3:9 Eze Edọm bụ onyeisi alaeze Jehoshafat họpụtara. Ị ga-ahụ nke a nʼakwụkwọ 1Ez 22:47; 2Ez 8:20
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.