2 Ndị Eze 3:14
2 Kings 3:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịlaisha sịrị, “Ebe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-adị ndụ, bụ onye m na-efe, a si na ọ bụghị nsọpụrụ m nwere nʼebe Jehoshafat eze Juda nọ, agaraghị m atụpụrụ gị ọnụ maọbụ lee gị anya nʼihu.
2 Kings 3:14 in English
2 Kings 3:14 · Berean Standard Bible
Then Elisha said, “As surely as the LORD of Hosts lives, before whom I stand, were it not for my regard for the presence of Jehoshaphat king of Judah, I would not look at you or acknowledge you.
Context
12Jehoshafat zara sị, “Okwu Onyenwe anyị dị nʼọnụ ya.” Ya mere, eze Izrel na Jehoshafat, na eze Edọm, gakwuru ya. 13Ịlaisha zara eze Izrel sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ? Jekwuru ndị amụma nne gị na nna gị, jụta ha ase.”
Eze Izrel zara sị ya, “Mba, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị kpọpụtara anyị bụ eze atọ nʼebe a, ka o were anyị nyefee nʼaka ndị Moab.” 14Ịlaisha sịrị, “Ebe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-adị ndụ, bụ onye m na-efe, a si na ọ bụghị nsọpụrụ m nwere nʼebe Jehoshafat eze Juda nọ, agaraghị m atụpụrụ gị ọnụ maọbụ lee gị anya nʼihu. 15Ma ugbu a, kpọtaranụ m onye na-akpọ ụbọ.”
Mgbe ọkpọ ụbọ ahụ malitere ịkpọ ụbọ ya, aka Onyenwe anyị bịakwasịrị Ịlaisha. 16Ọ sịrị, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, aga m eme ka ndagwurugwu a jupụta nʼolulu mmiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.