2 Ndị Eze 24:15
2 Kings 24:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nebukadneza kpụụrụ Jehoiakin ka ọ ga biri na Babilọn. O sikwa na Jerusalem kpọrọ nne eze, na ndị nwunye eze, ndị ozi ya, na ndị niile a ma ama nʼala ahụ gaa Babilọn.
2 Kings 24:15 in English
2 Kings 24:15 · Berean Standard Bible
Nebuchadnezzar carried away Jehoiachin to Babylon, as well as the king’s mother, his wives, his officials, and the leading men of the land. He took them into exile from Jerusalem to Babylon.
Context
13Ọ kwakọọrọ akụ niile dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ndị nke dị nʼụlọeze, o gbukakwara ihe ọlaedo niile Solomọn eze Izrel tinyere nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị buru ha bulaa Babilọn, ihe a niile mere dịka Onyenwe anyị kwururịị. 14O bupụkwara puku ndị ikom iri site na Jerusalem bulaa ha Babilọn dịka ndị a dọtara nʼagha. Ndị so nʼime ndị a bụ ndịisi niile na ndị agha niile. O bupụkwara ndị na-akwa ǹka niile na ndị ọkpụ ụzụ. Naanị ndị na-enweghị ike, na ndị ogbenye ka ọ hapụrụ nʼala ahụ. 15Nebukadneza kpụụrụ Jehoiakin ka ọ ga biri na Babilọn. O sikwa na Jerusalem kpọrọ nne eze, na ndị nwunye eze, ndị ozi ya, na ndị niile a ma ama nʼala ahụ gaa Babilọn. 16Eze Babilọn bupụkwara ndị ikom niile dị ike ma tozukwaa ibu agha, ndị ọnụọgụgụ ha dị puku asaa, tinyere otu puku ndị ọrụ aka, na ndị ọrụ ǹka, bulaa ha Babilọn. 17O mere nwanne nna Jehoiakin, bụ Matanaya, eze nʼọnọdụ ya. Ọ gụgharịrị ya aha, kpọọ ya Zedekaya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.