2 Ndị Eze 23:34
2 Kings 23:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Fero Neko mere Eliakịm nwa nwoke Josaya, eze, nʼọnọdụ Josaya bụ nna ya. Ọ gụgharịrị aha Eliakịm ka ọ bụrụ Jehoiakim. Ma o duuru Jehoahaz gaa Ijipt, ebe ọ nọ nwụọ.
2 Kings 23:34 in English
2 Kings 23:34 · Berean Standard Bible
Then Pharaoh Neco made Eliakim son of Josiah king in place of his father Josiah, and he changed Eliakim’s name to Jehoiakim. But Neco took Jehoahaz and carried him off to Egypt, where he died.
Context
32O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ndị eze buru ya ụzọ. 33Ma Fero Neko keere ya agbụ na Ribla nʼala Hamat, ime ka ọ ghara ịchịkwa na Jerusalem. Neko kwagidere ndị Juda ka ha tụọrọ ya ụtụ narị talenti ọlaọcha, na otu talenti ọlaedo. 34Fero Neko mere Eliakịm nwa nwoke Josaya, eze, nʼọnọdụ Josaya bụ nna ya. Ọ gụgharịrị aha Eliakịm ka ọ bụrụ Jehoiakim. Ma o duuru Jehoahaz gaa Ijipt, ebe ọ nọ nwụọ. 35Jehoiakim kwụrụ Fero Neko ọlaọcha na ọlaedo ahụ ọ nara nʼaka ya. Ka o nwee ike mee nke a, o kere ụtụ nʼala ahụ, werekwa ike nara ndị ala ahụ ọlaọcha na ọlaedo, dịka mkpebi ha si dị banyere ihe onye ahụ ga-akwụ. 36Jehoiakim gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jerusalem. Aha nne ya bụ Zebida nwa Pedaya, onye Ruma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.