Native Bible

2 Kings 23:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Eze nyere ndị Juda niile iwu sị ha, “Meerenụ Onyenwe anyị Chineke unu Mmemme Ngabiga, dịka e dere ya nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ a.”

2 Kings 23:21 in English

2 Kings 23:21 · Berean Standard Bible

The king commanded all the people, “Keep the Passover of the LORD your God, as it is written in this Book of the Covenant.”

Context

19Dịka o mere na Betel, otu a ka Josaya wepụrụ ma merụkwaa ebe ịchụ aja niile dị nʼebe niile dị elu nke ndị eze Izrel wuru nʼobodo niile nke Sameria, bụ ebe ịchụ aja kpasuru Onyenwe anyị iwe. 20O gburu ndị nchụaja chi ndị a niile nʼelu ebe ịchụ aja ha, suo ọkpụkpụ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ha. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, ọ laghachiri na Jerusalem. 21Eze nyere ndị Juda niile iwu sị ha, “Meerenụ Onyenwe anyị Chineke unu Mmemme Ngabiga, dịka e dere ya nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ a.” 22O nwebeghị mgbe e mere ụdị Mmemme Ngabiga dịka nke a nʼoge ọbụla, site nʼụbọchị ndị ikpe bụ ndị duru Izrel maọbụ nʼụbọchị ndị eze Izrel na eze niile chịrị Juda, ọ dịghị nke yiri Mmemme Ngabiga a. 23Ma ọ bụ nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị eze Josaya, nʼime Jerusalem ka a nọ mee Mmemme Ngabiga a nye Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.